— <b>Agụment iji mee mgbe a na-amalite ntinyenọrụ site na ahịrị nnyemiwu</b>

<big>M</big>gbe a na-amalite ya na agụment <tt>-v</tt> ma ọ bụ <tt>--version</tt>, a na-egosi àgbà Kickshaw ugbu a. Agụment <tt>-h</tt> na <tt>--help</tt> na-enyere aka igosi nkọwa nke otu esi enweta windò tipụ ga a, na-esokwa ndepụta agụment ndị a na-anabata.
Enwere ike imalite Kickshaw na ụzọ faịlụ gaa na menù dị ka agụment. Dị ka mmetụta n'akụkụ, nke a na-eme ka o kwe omume imeghe faịlụ menù na Kickshaw site na iji menù kèọnọdụ na ndị nlekọta faịlụ.

— <b>Faịlụ ndị Kickshaw mepụtara</b>

<b>Na-anọgide</b>

Kickshaw na-emepụta faịlụ ndịwube nke ya na aha <tt>.kickshawrc</tt>, nke dị n'ime dàịrektrị ụlọ òjìàrụ.

<b>Oge ntà</b>

Maka ndezìmà ọ bụla emere, a na-emepụta faịlụ ikpo mmeghasịà n'ime <tt>/tmp/kickshaw.XXXXXX</tt> (X ndị ahụ bụ ihe nnọchianya maka mkpụrụedemede na ọnụọgụgụ ọ bụla). Ọ bụrụ na akwụsị ntinyenọrụ na mberede, foldà ahụ ga-anọgide, mana nke a ekwesịghị ibute nchegbu ebe ọ bụ na o nwere naanị faịlụ ndị ntà ma a na-ehichapụ ya akpaghị aka n'oge ikpeazụ n'oge mmalitegharịa ọzọ.

Kickshaw na-emepụtakwa faịlụ nchekwammerenonwe n'ime foldà ụlọ na aha <tt>.kickshaw_autosave</tt>. A na-emelite ya mgbe ndezìmà ọ bụla ma kachapụ ya mgbe emechiri ntinyenọrụ ahụ. Ọ bụrụ na akwụsị Kickshaw n'ụzọ na-ezighị ezi, site na mmalite ntinyenọrụ ọzọ, a na-ajụ òjìàrụ ma ọ ga-eweghachi menù site na nchekwammerenonwe ma ọ bụ ka kachapụ nchekwammerenonwe ahụ.
